1 Samuel 16

Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”

1 Samuel 16:10 (UKJV) Again, Jesse made seven of his sons to pass before Samuel. And Samuel said unto Jesse, The LORD has not chosen these.

8Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”

9Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”

10Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”

11Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”

12Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.