11Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu.
12Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke.
13Atọ nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ Eliab, ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na Shama, nwa nke atọ.
14Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.
15Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem.