34Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,
35achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.
36Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!
37Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.”
38Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.