35achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.
36Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!
37Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!” Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka Onyenwe anyị nọnyere gị.”
38Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.
39Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị. Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha.