14Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na Onyenwe anyị na-anọnyere ya.
15Mgbe Sọl hụrụ na ọ bụ onye nwere uche nke ọma, ọ tụrụ ya ụjọ.
16Ma Izrel na Juda niile hụrụ Devid nʼanya, nʼihi na ọ na-edu ha nʼagha.
17Sọl gwara Devid okwu sị ya, “Lee ada m nwanyị Merab. Aga m akpọnye gị ya, ka ị lụọ ya. Naanị jeere m ozi, lụọkwa agha Onyenwe anyị.” Nʼihi na Sọl kwuru nʼime obi ya sị, “Agaghị m ewelite aka m megide ya. Ka ndị Filistia mee nke ahụ.”
18Ma Devid sịrị Sọl, “Onyekwanụ ka m bụ, gịnịkwa bụ ezinaụlọ m maọbụ agbụrụ m nʼIzrel, nke m ga-eji bụrụ ọgọ nwoke eze?”