1 Samuel 19

Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.”

1 Samuel 19:15 (UKJV) And Saul sent the messengers again to see David, saying, Bring him up to me in the bed, that I may slay him.

13Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.

14Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.”

15Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.”

16Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.

17Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.