15Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.”
16Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
17Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”
18Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
19Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,”