16Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.
17Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?” Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”
18Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt.
19Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,”
20ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma.