1 Samuel 19

Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt.

1 Samuel 19:23 (UKJV) And he went thither to Naioth in Ramah: and the Spirit of God was upon him also, and he went on, and prophesied, until he came to Naioth in Ramah.

21Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ.

22Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”

23Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt.

24O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.