1 Samuel 19

Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”

1 Samuel 19:6 (UKJV) And Saul hearkened unto the voice of Jonathan: and Saul swore, As the LORD lives, he shall not be slain.

4Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu.

5Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?”

6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”

7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.

8Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.