6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”
7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.
8Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.
9Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara,
10Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ.