1Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.
2“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.
3“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.