10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.
12Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya.
13Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya.
14Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo.