7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba; ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.
8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ. Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ, na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
9Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.
10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa. Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ike bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”
11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.