16Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
17Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
18Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
19Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
20Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.