14Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
15E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
16Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
17Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
18Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.