1 Samuel 20

Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”

1 Samuel 20:32 (UKJV) And Jonathan answered Saul his father, and said unto him, Wherefore shall he be slain? what has he done?

30Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?

31Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”

32Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”

33Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid.

34Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.