1 Samuel 20

Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?

1 Samuel 20:30 (UKJV) Then Saul's anger was kindled against Jonathan, and he said unto him, You son of the perverse rebellious woman, do not I know that you have chosen the son of Jesse to yours own confusion, and unto the confusion of your mother's nakedness?

28Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.

29Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”

30Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?

31Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”

32Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.