1 Samuel 20

Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”

1 Samuel 20:29 (UKJV) And he said, Let me go, I pray you; for our family has a sacrifice in the city; and my brother, he has commanded me to be there: and now, if I have found favour in yours eyes, let me get away, I pray you, and see my brethren. Therefore he comes not unto the king's table.

27Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?”

28Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.

29Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”

30Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?

31Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.