6Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’
7Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ.
8Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?”
9Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”
10Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?”