1 Samuel 21

Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.

1 Samuel 21:12 (UKJV) And David laid up these words in his heart, and was sore afraid of Achish the king of Gath.

10Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.

11Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”

12Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.

13Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.

14Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.