12Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
13Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
14Akish gwara ndị ozi ya okwu sị ha, “Leenụ nwoke a! Ọ bụ onyeisi mebiri! Gịnị mere unu ji kpọtara m ya?
15Ndị na-ayị ara ha kọrọ m, nke mere unu ji kpọtara m nwoke a nʼebe a ka ọ bịa na-eme ka onye na-ayị ara nʼihu m? O kwesiri ka onye dị otu a bata nʼụlọ m?”