1 Samuel 23

Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.

1 Samuel 23:10 (UKJV) Then said David, O LORD God of Israel, your servant has certainly heard that Saul seeks to come to Keilah, to destroy the city for my sake.

8Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.

9Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”

10Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.

11Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.”

12Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.