1 Samuel 23

Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.

1 Samuel 23:8 (UKJV) And Saul called all the people together to war, to go down to Keilah, to besiege David and his men.

6(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).

7Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.”

8Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.

9Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”

10Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.