16Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke.
17Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.”
18Ha abụọ gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya.
19Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn?
20Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”