27Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.”
28Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa.
29Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.