1 Samuel 24

Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.”

1 Samuel 24:1 (UKJV) And it came to pass, when Saul was returned from following the Philistines, that it was told him, saying, Behold, David is in the wilderness of Engedi.

1Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.”

2Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.

3Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.