3Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
4Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.”
5Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila.
6(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).
7Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.”