14Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba.
15Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị.
16Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ.
17Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.”
18Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu.