1 Samuel 25

Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.

1 Samuel 25:2 (UKJV) And there was a man in Maon, whose possessions were in Carmel; and the man was very great, and he had three thousand sheep, and a thousand goats: and he was shearing his sheep in Carmel.

1Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ.

2Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.

3Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.

4Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.