1 Samuel 25

Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,

1 Samuel 25:4 (UKJV) And David heard in the wilderness that Nabal did shear his sheep.

2Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel.

3Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.

4Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,

5o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.

6Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.