1 Samuel 25

o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.

1 Samuel 25:5 (UKJV) And David sent out ten young men, and David said unto the young men, Get you up to Carmel, and go to Nabal, and greet him in my name:

3Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri.

4Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya,

5o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m.

6Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.

7“ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.