1 Samuel 25

Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.

1 Samuel 25:33 (UKJV) And blessed be your advice, and blessed be you, which have kept me this day from coming to shed blood, and from avenging myself with mine own hand.

31onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.”

32Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m.

33Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.

34Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”

35Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.