1 Samuel 25

Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”

1 Samuel 25:35 (UKJV) So David received of her hand that which she had brought him, and said unto her, Go up in peace to yours house; see, I have hearkened to your voice, and have accepted your person.

33Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ.

34Ma ọ bụghị otu a, dịka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.”

35Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.”

36Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ.

37Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.