1 Samuel 25

Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ”

1 Samuel 25:8 (UKJV) Ask your young men, and they will show you. Wherefore let the young men find favour in yours eyes: for we come in a good day: give, I pray you, whatsoever comes to yours hand unto your servants, and to your son David.

6Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere.

7“ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel.

8Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ”

9Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa.

10Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.