8Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.”
9Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?”
10Ọ sịrị, “Nʼezie dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo.
11Ma Onyenwe anyị ekwela ka m setịpụ aka megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ. Ugbu a, weta ùbe na ihe ịṅụ mmiri nke dị nʼakụkụ isi ya, ka anyị si nʼebe a pụọ.”
12Devid weere ùbe ya na ite mmiri dị nʼakụkụ isi Sọl, ha sitere nʼebe ahụ pụọ. Ọ dịkwaghị onye hụrụ ha. Ọ dịkwaghị onye tetara, nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ha daba nʼoke ụra.