6Devid sịrị Ahimelek onye Het, na Abishai, nwa Zeruaya onye bụ nwanne Joab, “Onye ga-eso m gaa nʼogige ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọ ikwu ha?” Abishai zara sị, “Aga m eso gị gaa.”
7Ya mere, nʼabalị, Devid na Abishai jiri nwayọọ jeruo ebe ndị agha Sọl mara ụlọ ikwu ha. Ha hụrụ Sọl ebe o dinara ala na-arahụ ụra. Ùbe ya ka ọ manyekwara nʼala nʼakụkụ ebe isi ya dị. Abna, na ndị agha ndị ọzọ dina gburugburu Sọl na-arahụ ụra.
8Abishai sịrị Devid, “Nʼezie, Chineke enyefeela gị onye iro gị nʼaka taa. Ugbu a, kwere ka m gaa were ùbe magide ya nʼala otu ugboro; agaghị m atụ ya ugboro abụọ.”
9Ma Devid sịrị Abishai, “Mba egbula ya. Onye ga-eseti aka ya megide onye Onyenwe anyị tere mmanụ, ghara ị bụ onye ikpe na-amaghị?”
10Ọ sịrị, “Nʼezie dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụ Onyenwe anyị ya onwe ya ga-etida ya, maọbụ oge ya ga-eru mgbe ọ ga-anwụ, ma ọ bụkwanụ ọ gaa agha, ọ nwụfuo.