8Devid na ndị ikom ya nọgidere oge ahụ niile na-emegide ndị Geshua, ndị Gizi na ndị Amalek. (Site na mgbe ochie ndị a bi nʼala ahụ gbatịrị ruo Shua na Ijipt)
9Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.
10Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”
11Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.
12Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”