1 Samuel 27

Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.

1 Samuel 27:11 (UKJV) And David saved neither man nor woman alive, to bring tidings to Gath, saying, Lest they should inform against us, saying, So did David, and so will be his manner all the while he dwells in the country of the Philistines.

9Mgbe ọbụla Devid wakporo akụkụ ọbụla, ọ dịghị ahapụ nwoke maọbụ nwanyị ndụ. Ma ọ na-akpụrụ atụrụ ha, na ehi ha, na ịnyịnya ibu ha, na ịnyịnya kamel ha, nakwa uwe ha. Emesịa, ọ na-alọghachikwuru Akish.

10Ọ bụrụ na Akish ajụọ Devid ajụjụ sị, “Ndị ole ka unu busoro agha taa?” Devid ga-aza sị, “Ọ bụ ndị bi na ndịda Juda”, maọbụ “ndị ndịda Jerahmel”, maọbụ “ndị ndịda Ken.”

11Ma ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị onye ọ hapụrụ ndụ, nke a ga-akpọta na Gat, nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ha nwere ike ịbịa kwuo megide anyị, sị, ‘Otu a ka Devid mere.’ ” Otu a ka ọ na-emekwa ọtụtụ oge ahụ niile o bi nʼetiti ndị Filistia.

12Akish kwenyere Devid, kwuo nʼobi ya sị, “Devid abụrụla ihe a kpọrọ asị nʼebe ndị nke ya bụ ndị Izrel nọ. Ọ ga-abụkwara m ohu ruo mgbe niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.