1Nʼoge ahụ, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha jikere ịlụso ndị Izrel agha. Akish eze Gat gwara Devid okwu, “Ghọtakwa na gị na ndị agha gị ga-eso mụ na ndị agha m gaa ibu agha.”
2Devid zara ya sị, “Ị ga-eji anya gị hụrụ ihe ohu gị ga-eme.” Akish zara sị, “Ọ dị mma aga m eme gị onye nche m ụbọchị ndụ gị niile.”
3Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ.