1 Samuel 28

Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”

1 Samuel 28:11 (UKJV) Then said the woman, Whom shall I bring up unto you? And he said, Bring me up Samuel.

9Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?”

10Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.”

11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”

12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”

13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.