1 Samuel 28

Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”

1 Samuel 28:13 (UKJV) And the king said unto her, Be not afraid: for what saw you? And the woman said unto Saul, I saw gods ascending out of the earth.

11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”

12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”

13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”

14Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.

15Samuel sịrị Sọl, “Gịnị mere i ji esogbu m, site na ịkpọlite m?” Sọl zara, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ndị Filistia na-ebuso m agha, ma Chineke esitekwala nʼebe m nọ wezuga onwe ya. Ọ naghị azakwa m ọzọ, maọbụ site na ndị amụma, maọbụ site na nrọ. Nʼihi ya ka m ji kpọọ gị, ịjụ gị ihe m ga-eme.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.