1 Samuel 28

Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”

1 Samuel 28:12 (UKJV) And when the woman saw Samuel, she cried with a loud voice: and the woman spoke to Saul, saying, Why have you deceived me? for you are Saul.

10Ma Sọl jiri Onyenwe anyị ṅụọra ya iyi, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị ata gị ahụhụ nʼihi ihe a.”

11Mgbe ahụ, nwanyị ahụ jụrụ, “Onye ka ị chọrọ ka m mee ka ọ rịgokwute gị?” Sọl sịrị, “Mee ka Samuel rịgokwute m.”

12Mgbe nwanyị ahụ hụrụ Samuel, o tiri mkpu sị, “Gịnị mere iji ghọgbuo m? Gị onwe gị bụ Sọl!”

13Eze sịrị ya, “Atụla egwu! Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwanyị ahụ sịrị, “A hụrụ m chi ka o si nʼala na-arịgopụta.”

14Sọl jụrụ, “Gịnị ka onye ahụ yiri nʼọdịdị?” Ọ sịrị, “Ọ bụ agadi nwoke na-arịgota, e ji uwe mwụda kpuchie ahụ ya.” Mgbe ahụ, Sọl matara na ọ bụ Samuel. O kpuru ihu nʼala, kpọọkwa isiala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.