1 Samuel 28

Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.

1 Samuel 28:18 (UKJV) Because you obeyed not the voice of the LORD, nor executed his fierce wrath upon Amalek, therefore has the LORD done this thing unto you this day.

16Samuel sịrị, “Nʼihi gịnị ka i ji na-ajụ m, ebe ọ bụ na Onyenwe anyị ewezugala onwe ya site nʼebe ị nọ, ghọọkwara gị onye iro?

17Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.

18Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.

19Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”

20Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.