1 Samuel 28

Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”

1 Samuel 28:19 (UKJV) Moreover the LORD will also deliver Israel with you into the hand of the Philistines: and tomorrow shall you and your sons be with me: the LORD also shall deliver the host of Israel into the hand of the Philistines.

17Onyenwe anyị emeela ihe ọ sị na ọ ga-eme. Ọ napụla gị alaeze gị were ya nye Devid.

18Ihe ndị a niile na-aga ịdakwasị gị nʼihi na i geghị ntị na ndụmọdụ Onyenwe anyị, mgbe o were iwe dị ọkụ megide ndị Amalek.

19Onyenwe anyị ga-arara gị na ndị Izrel nyefee nʼaka ndị Filistia, echi gị na ụmụ gị ndị ikom ga-abịa nọnyeere m nʼebe a. Onyenwe anyị ga-ararakwa ndị agha Izrel nye nʼaka ndị Filistia.”

20Ngwangwa, Sọl dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼoke egwu, nʼihi okwu ndị a niile Samuel kwuru. Ike adịghịkwa nʼime ya nʼihi agụụ, ebe ọ bụ na o ribeghị nri ọbụla ụbọchị ahụ niile.

21Mgbe nwanyị a hụrụ ọnọdụ Sọl, ọ gwara ya okwu sị ya, “Onyenwe m, lee, ohu gị rubere isi mee ihe ị sị m mee. Ọ bụkwa ndụ m ka m ji chụọ aja imezu ihe ị rịọrọ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.