2O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma.
3Mgbe ahụ, oriọna Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị.
4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”
5O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala.
6Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?” Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.”