20Ọzọkwa, Devid chịkọtara igwe ehi na igwe ewu na atụrụ. Ndị ikom ya chịịrị ha, tinyere anụ ụlọ ndị ọzọ, na-aga, na-asị, “Ndị a bụ ihe Devid kwatara nʼagha.”
21Emesịa, Devid bịarutere ebe narị ndị ikom abụọ ndị ahụ nọ na Ndagwurugwu Beso. Ndị a bụ ndị ahụ na-enweghị ike iso Devid nʼihi na ike gwụrụ ha. Ha pụtara zute Devid na ndị so ya. Mgbe Devid na ndị ikom ya bịara ha nso, ọ jụrụ ha otu ha mere.
22Ma ndị ikom ọjọọ ahụ niile, na ndị okwu na ụka nọ nʼetiti ndị na-eso Devid sịrị, “Nʼihi na ndị a esoghị anyị jee, ya mere ha agaghị eso anyị keta ihe ndị a anyị kwatara nʼagha. Nyeghachi ha naanị nwunye ha na ụmụ ha; gwakwa ha ka ha laa.”
23Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
24Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”