23Ma Devid sịrị, “Mba, ụmụnna m, unu ekwesighị isi otu a kee ihe ndị ahụ Onyenwe anyị nyere anyị. O chebere anyị, nyefee nʼaka anyị ndị agha ahụ niile bịara imegide anyị.
24Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”
25Site nʼụbọchị ahụ, Devid mere ka nke a bụrụ iwu nye ndị Izrel niile ruo taa.
26Mgbe ha rutere Ziklag, Devid weere ụfọdụ ihe ha kwatara nʼagha zigara ndị okenye Juda, ndị bụ ndị enyi ya, na-asị, “Lee onyinye ewetaara unu site nʼụfọdụ nʼime ihe anyị kwatara site nʼaka ndị iro Onyenwe anyị.”
27O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa,