2Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn.
3Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya.
4Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.
5Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd.
6Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile.