1 Samuel 6

“Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi.

1 Samuel 6:7 (UKJV) Now therefore make a new cart, and take two milk giving cattle, on which there has come no yoke, and tie the cattle to the cart, and bring their calves home from them:

5Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ.

6Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa?

7“Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi.

8Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso.

9Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.